Hilda Baci : Ihe o riri m inweta mmeri dịka onye kachasị sie nri ogologo oge
Ebe foto si, Hilda Baci/Facebook/GWR/Facebook
Guinness World Records agbaala ama na Hilda Baci bụ onye kacha sie nri ogolo awa n’ụwa n’aha ụlọọrụ ha.
N’ozi ha wepụtara ụbọchị 13 nke ọnwa Juun 2023 ka izuụka olemole gachara mgbe ha kwuru na ha na-enyocha atụmatụ Baci.
N’onyonyo ha wepụtara, ụlọọrụ Guinness World Records kwuru na Baci esirughi nri ruo awa 100 dịka e sibu chee.
Ha kwupụtakwara usoro ha ji mee nnyocha ma kwuo na Hilda mere ihe niile e kwesiri ka o mee.
Dịka ozi ha kwuru ngụkọ awa e mere n’oge ọ nwara ihe a adịghị etu ọha siri chee.
Ma kọwaa na onye na-anwa atụmatụ a kwesịrị izuike kwa mgbe kwa mgbe mana ngụkọ oge izu ike Baci na oge isi nri ya mere ha agaghi enweike kwuo kpọm kwem na o siri nri ruo awa 100.
Ozi ha gara n’ihu kwuo.
“Anyị agaghị enweike nye ya ihe nrite n’aha awa 100 dịka ihe nnyocha anyị gosiri bụ na ọ bụ awa 93 awa na njeki 11 ka o siri nri”
Enyeela Baci ihe nri atụmatụ onye kacha sie nri ogologo awa dịka ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa amalitela izipụta ozi ọṅụ maka ihe a Hilda mere.
Na mkparịtụka ya na BBC nwere, Baci kwuru na ọ bụ afọ ise gara aga ka ọ banyere ya uche ịgbali me ihe o nwebeghị onye mere ya n'isi nri.
Malite ụbọchị Tọzde abalị 11 nke ọnwa Mee, rue Monde 15 nke ọnwa Mee afọ 2023, Hilda gbara afọ 27 siri nri rue awa 100 nke tụrụ ọtụtụ mmadụ n'anya dịka ọ napụrụ nwaanyị bubu onye kachasị sie nri ogologo oge n'ụwa bụ Lata Tondon nke India.
N'afọ 2019, Lata Tondon siburu nri awa 87,nkeji 45.
Nwaada Naịjirịa bụ Hilda Effiong Bassey ekwuola na ebumnuche ya o ji chọọ itinye aha ya n'akwụkwọ Guiness World Record bụ iji gbanwee ọtụtụ akụkọ ọjọọ na-apụtakarị gbasara ndị ntorobịa Naịjirịa ọ kachasị ụmụnwaanyị.
O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere dịka ọ kwụsịrị asọmpi iji bụrụ onye kacha sie nri ogologo oge na-akwụsịghị akwụsị n'ụwa niile.
Gbasara ihe mere o ji malite atụmatụ a, o kwuru na "achọrọ m igosi na ndị Naịjirịa bụ ezigbo mmadụ nwereike imepụta ezigbo ihe a hụrụ anya."
"Ọtụtụ akụkọ na-efesa ugbua bụ na ndị ntorobịa Naịjirịa bụ ndị e ji ihe ọjọọ dị icheiche dịka ohi ịntanetị, mara, mana ọ bụrụ na akụkọ ọma gbasara ndị ntorobịa Naịjirịa malitekwa ifesa, ọ ga-eme ka ụwa niile mata na e nwere ọtụtụ ezigbo mmadụ na Naịjirịa," ka o kwuru.
Hilda Bassey na nne ya
Ọ kọwakwara na ya chọrọ iji ohere ahụ gosipụta ọtụtụ nri mara mma nke e ji mara omenala dị icheiche, iji mee ka ụwa niile mara nri ndị a, na-esikwa ha n'ụlọ nri dị icheiche n'ụwa niile, ka ndị mmadụ na-erikwa ha."
Bassey, onye e ji Hilda Baci mara, malitere isi nrị n'elekere anọ nke mgbede ụbọchị 11 nke ọnwa Mee 2023, ma sigide nri gafee awa 100 tupu ọ kwụsị n'ebe elekere asatọ nke abalị ụbọchị 15 nke ọnwa Mee 2023.
Ọ chọrọ ịkụchapụ Lata Tondon, nwaada mba India, bụ onye aha ya dị n'akwụkwọ Guiness World Record dịka onye kacha sie nri ogologo ogena-akwụsịghị akwụsị.
Ndị Guiness World Record ekwuola na ha ga-ewepụta ozi ma ọ bụrụ na ha nyochachaa asọmpi a Hilda Baci mere iji mata ma o debekwara iwu niile ha nyere.
Ebe foto si, Hilda Baci
Hilda Baci kwuru na ọ bụ nne ya onye bụkwa onye osi ite ka ọ na-eṅọmị
Nwaada Naịjirịa bụ Hilda Effiong Bassey, onye e ji Hilda Baci mara, etinyela aha ya nakwa aha Naịjirịa n'akwụkwọ akụkọ dịka ọ bụụrụ onye kacha sie nri ogologo oge na-akwụsịghị akwụsị n'ụwa niile.
N'elekere asatọ na nkeji 40 nke abalị Mọnde a, Hilda mezuru ebumnobi ya isi nri ruo awa 100.
Ọtụtụ ndị ụmụafọ Naịjirịa ọkachasị ndị ntorobịa wụjuru n'ogige ebe nwaada mere a ihe a. Ọnụ, aṅụrị, ịgba mkpọ n'ala, ịgba egwu, ịbụ abụ ịgba ume nakwa ihe ọma niile jụpụtara ebe ahụ nwaada a mere ihe a. Kemgbe abalị ole m ole, atụmatụ Baci jịkọrọ ụmụafọ Naịjirịa ọnụ dịka a na-agba ya ume ma na-eto ya.
Baci mere nke a dịka ọ nwara itinye aha ya n'akwụkwọ Guinness World Record dịka onye kacha sie nri ogologo oge, bụ nke onye meburu ya na mbụ bụ nwaada mba Indaia aha ya bụ Tata Tondon n'afọ 2019.
Kamgbe ụbọchị 11 nke ọnwa Mee ka Hilda Baci malitere isi nri ruo, mana a na-ele anya na ọ ga-akwụsị n'ebe elekere anọ nke mgbede ụbọchị 15 nke ọnwa Mee 2023.
Ụlọọrụ Guinness World Record zipụtara ozi na Mọnde a kwuo na ha ma maka ihe a Hilda na-eme ma kwukwa na ha na-eme nnyocha ịma ma a ga-akpụta ya dịka onye mmeri.
Agbanyeghi na enweghi onye ụlọọrụ ha nọ ebe ahụ, ọtụtụ ihe na-ese onyonyo nọcha ebe ahụ etinye anya n'ihe a nwaada na-eme.
Ọ bụ ndị ụlọọrụ Guinness World Record ka ọ dịịrị ikwu ma o mezuru ihe ha nyere n'iwu iji bweta nturuugo onye kacha sie nri ogologo oge n'ụwa.
Ebe foto si, hildabaci/instagram
Ebe foto si, sanwoolu/hildabaci
Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu so na ndị gara nye Hilda Baci nkwado
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari zitere ya ozi ekele n'ụtụtụ Mọnde.
Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu gara na mpaghara Lekki ịga gosi nkwado ya maka nwaada Hilda Effiong Bassey, onye a ma dịka Hilda Baci, bụ onye nọ asọmpi idebenye aha ya n'akwụkwọ Guiness World Record.
Nwaada Baci chọrọ ịbụ onye kacha sie nri ogologo oge n'ụwa, dịka ọ malitere asọmpi isi nri a kamgbe ụbọchị 11 nke ọnwa Mee.
Gọvanọ Sanwo-Olu na ụfọdụ ndị ọrụ ya so mee njem a n'ehihe Sọnde a, abalị 14 nke ọnwa Mee, 2023 iji nye hilda nkwado ma jalite mmụọ ya.
Site n’ozi Hilda kesara na soshal midia ya, a hụrụ ebe o dere na Osote onyeisiala Naijirịa bụ Yemi Osibanjo kpọrọ ya n’ekwenti ma gbaa ya ume n’ọrụ ya.
Gọọmentị Akwa Ibom bụ steeti osi zipụtakwa ozi too ya ma ya ume.
Ozi nke kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Ini Ememobong binyereaka dere: “Anyị na-ele etu Hilda Bassey Effiong si agba mbọ inweta ihe mmeri na Guiness Book of World Records… Ihe a ọ na-anwa agbaala nrị anyị n’anwụ n’ihu ụwa, ọ bụ ihe iji mee ọnụ nye steeti anyị nakwa omenala anyị.”
Gọvanọị Dapo Abiodun nke Ogun steeti ezipụtakwala ozi nye ya bụ nwaada ma kwuo:
“Osiite Hilda, anyị na-eto gị maka etu isi tinye uchu n'igosipụta ugboro ugboro na ịrụsi ọrụ ike, ịgba isi akwara n’ọrụ nakwa ịnwe mmụọ dị ọkụ n’ọrụ gị… ihe ọ bụla ga-ekwe omume.”
Ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ ezipụtakwala ozi na-agba nwaada ume gụnyere Peter Obi onye zọọrọ Labour Party ọkwa onyeisiala, Atiku Abubakar bụbu osote onyeisiala Naịjirịa nakwa onye zọọrọ PDP ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023.
Ọtụtụ ndị a ma ama na Naịjirịa, tinyere ndị otiegwu, ndị ọgbaegwu, ndị ọkpa ọchị, nakwa ndị na-eme ejije egosila Hilda nkwado.
Ebe foto si, myfoodbyhilda/Instagram
Hilda Effiong Bassey, onye a ma dị Hilda Baci, bụ nwaada Naịjirịa aha ya na-ewu ebe niile na soshal midia ugbua, n'ihi asọmpi isi nri nke ọ malitere kamgbe abalị atọ gara aga.
Nwa ada a dị afọ 27 chọrọ idebanye aha ya nakwa aha Naịjirịa n'akwụkwọ 'Guiness Book of Records' dịka onye kacha sie nri ogologo oge n'ụwa niile.
Ọ chọrọ iji nke a kụchapụ Lata Tondon nke mba India bụ onye ji nturuugo maka ogologo oge mmadụ siri nri, dịka o siri nri akwụsịghị akwụsị ruo awa 87 na nkeji 45 n'obodo Rewa nke mba India n'afọ 2019.
Hilda malitere asọmpi ya n'ụbọchị Tọzde bụ ụbọchị 11 nke ọnwa Mee, ebe ya bụ asọmpi ga-akụrụ ọnụ taa bụ Sọnde, ụbọchị 14 nke ọnwa Mee.
"Njem a iji tinye aha m n'akwụkwọ Guinness Book of Records' malitere afọ ise gara aga," Hilda kwuru na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ.
"Ọ bụ otu n'ime ihe ndị m kachc chọọ imejupụta na ndụ m. Akwadoola m maka ya nke ọma n'ụzọ dị icheiche."
"Asọmpi a bụ ọhere iji kọọ akụkọ ọma dị icheiche gbasara Afrịka site n'ụdị nri dị icheiche anyị nwere.
"Ọ bụkwa iji gosipụta ike nke ndị ntorobịa Naịjirịa nwere iji gosipụta ihe ha nwereike imenwu ma ọ bụrụ na e nye ha nkwado kwesịrị ekwesị."
Ebe foto si, myfoodbyhilda/Instagram
Ka ọ dị ugbua, ọ gafeela awa 64 kamgbe Hilda Baci malitere asọmpi isi nri a, mana ọ fọdụụrụ ya awa 32 iji ruo oge ọ na-ele anya iji tinye aha ya n'akwụkwọ akụkọ mba ụwa.
Kamgbe ọ malitere asọmpi a n'ụbọchị Tọzde, o siela nri karịrị 110 ma nyekwa ndị mmadụ karịrị 2,795 nri.
Ọtụtụ ndị ntorobịa Naịjirịa jupụtara n'Amore Gardens dị na Lekki, Legọs, bụ ebe asọmpi isi nri a na-aga n'ihu, iji nye Hilda nkwado.
Na soshal midia, ọtụtụ na-etinyekwa ozi nkwado dị icheiche iji jaa ya ike, dịka 'rooting for Hilda' bụ ihe kacha ewu ewu n'ọbaozi Twitter Naịjirịa n'ụtụtụ Sọnde a.
'Hilda Baci' sokwa n'otu ihe ndị mmadụ kacha chọọ n'ọbaozi Google n'ụbọchị Satọde, Mee 13.
© 2023 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga.