‘Egbe ndị ohi gbara m n’anya mere m ekpuo isi mana ọ bụrụla ihe ngọzị nye m ugbua’
Otu nwoke aha ya bụ Tomi Waziri kọọrọ BBC Igbo etu ihe mberede siri zute ya n’ụzọ mgbe ọ dị afọ 27 ma na-arụ ọrụ ọkwọ ụgbọala.
Ọ kọwara na ndị ohi mmadụ abụọ o chee dị afọ ebe 18 zutere ya n’ụzọ ebe o bu onye njem si otu akụkụ Legọs na-aga akụkụ ọzọ.
Ka o si kọọ, ndị ohi ahụ gbara ya egbe n’anya ma ghara ya gbaa ọsọ. Eze ya abụọ dapụkwara n’ihe a mere.
Ọ kọwara na ọ chere na ọ ga-anwụ mana e mechara buga ya ụlọọgwụ.
Ka ọ gabịgara ihe ndị a mmụọ ya kụdara dịka ikpu isi amaghi ya ahụ, nke tinyere n’ọnọdụ ọrịa mmụọ ịda oke mba nke Bekee na-akpọ ‘Depression’.
Tomi na nwunye ya amụọla otu nwa dịka ọ na-ejizi akụkọ ihe mere ya enyere ndị mmadụ aka
O kwuru na nke a mechara kpalite mmụọ ya inyere ndị mmadụ nọ n’ọnọdụ ọjọọ aka ma zitere ha ezigbo ozi ọma na ozi iti aka n’obi.
“E nwere otu ụbọchi m chọrọ itinye ihe e ji asacha eze n’atụ m mana nke a ekweghi m, e bere m oke akwa ụbọchị ahụ.”
“E mechara m gbaa onwe m ume na kwuo na m ga-eji akụkọ ihe ndị mere m na-agba ndị ọzọ ume.”
O mechara hụ otu nwaanyị nke rịọrọ ya ka ha lụọ, nke o kwuru bụ ihe ịtụn’anya nye ya.
Ugbua, ya na nwunye ya amụtala nwa dịka ọ na-arụzị ọrụ dịka onye na-akwalite ikike dịrị ndị nwere nkwarụ ọkachasị ndị kpuru isi.
N’okwu ya ọ kọwara “Naanị ihe na-emetụta m bụ na m amaghị etu ihu nwa m dị”
O kwukwara na ọ gụọla akwụkwọ dịka onye na-adụ ndị mmadụ ọdụ ma bụrụkwa onye ọkaibe n’inyere ndị na-enwe ọnọdụ ahụike nke ụbụrụisi aka site n’ọzụzụ ọ nwetere.
Mmasị ọ nwere n’okwu ọchịchị nakwa ihazị iwu obodo emeela ọ malite na-agba mbọ ịhụ na gọọmentị nyere na kwalitere ndị nkwarụ ikike dịrị ha.
Waziri na-ejikwa akara soshal midia ya ugbua agbasaozi na-akpu ndị mmadụ ka ha ghọta ihe ndị nkwarụ na-agabịga.
Gere ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyo nọ n'elu akụkọ a.
© 2023 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga.